Stebụlkọịn
Ego dijitalụ maka iji kwa ụbọchị
Stebụlkọịn bụ tokin Ethereum e mebere ka ọ nọrọ n'ọnụahịa a kapịrị ọnụ, ọbụlagodi mgbe ọnụahịa ETH gbanwere.

Kedu ihe o jiri bụrụ stebụlkọịn?
Stebụlkọịn bụ ego kripto nke ihe adịghị akwagharị. Ha nwere ọtụtụ ụdị ike ETH nwere mana uru ha kwudosiri ike, dị ka ego obodo. Nke a bụ na i nwere ikike iji ego stebụlkọịn n'Ethereum. Etu stebụlkọịn si enweta ịkwụdosi ike ha
Stebụlkọịn gbara gbururu gburu, ma o nwekwara ike izipunwu ha ebe ọbụla n'ịntanetị. Ha di mfe inweta maọbụ izipu ma ọ bụrụ na i nwere akaụntụ Ethereum.
Ọchịchọ stebụlkọịn dị elu, nke a bụ na ị ga-amitanwu ọmụrụnwa make ibinye ego nke gi. Gbaa mbọ hụ na ị matara ihe na-eweta ọghọm tupu i binye ego.
E nwere ike iji stebụlkọịn gbanwee ETH na tokin Ethereum ndị ọzọ. Ọtụtụ ngwa dapp na-adabere na stebụlkọịn.
A na-eji kriptografi echekwa stebụlkọịn. E nweghi onye ga-aghọrịnwu nzikọ azụmahịa na nnọchi anya gi.
Bitcoin pizza a ma ama
Na 2010, mmadụ ji Bitcoin 10,000 zụta pizza 2. N'oge ọnụ ahịa ndị bụ ~$ 41USD. N'ahịa taa, nke ahụ bụ nde kwuru nde dollar. E nwere ọtụtụ azụmahịa dị etu a na-enye mwute n'akụkọ Ethereum. Stebụlkọịn doziri nsogbu a, yabụ i nwere ike ịta Pizza gị ma jigide ETH gị.
Chọta ego stebụlkọịn
E nwere ego stebụlkọịn narị kwuru narị dị. Ndị a bụ ụfọdụ ga-enyerenwu gị aka iji malite. Ọ bụrụ na ị bidoro ọhụrụ n'Ethereum, anyị na-akwado ka i burugodu ụzọ mee nnyocha.
Mmasị ndị ndezi
Ugbua, ndị a bụ ọmụmatụ stebụlkọịn ma bụrụkwa mkpuru ego ndị anyị hụrụ bara uru mgbe anyị na-eji dapp.
Dai
Dai bụ mkpụrụ ego kripto na-adịghị adagharị adagharị nke na-enweghi onye isi a kacha mara. Ọnụahịa ya bụ ihe dị ka otu dọla ma bụrụkwa nke a kacha anabata n'etiti dapp ndị ọzọ.

USDC
USDC nwere ike ịbụ stebụlkọịn ego fịyatị kwadoro nke a kacha mara. Ọnụahịa ya bụ ihe dị ka otu dọla ma ego Sekụl na Kọịnbez kwadokwara ya.

Stebụlkọịn nke sitere n'irite uru ahịa
Irite uru ahịa bụ mkpokota ọnụọgụ dị nke mụbara ọnụ ahịa nyere tokin n'otu n'otu. Ndeputa nke a na-agbanwe agbanwe ma arụmọrụ dị na ya e deputara ebe a enwechaghị nkwado sitere n'ethereum.org team.
Ego | Irite uru ahịa | Ụdị nke ihe ihe akaebe | ↗ |
---|---|---|---|
![]() | $98,730,445,435 | Fịyatị | Go to Tether(opens in a new tab) |
![]() | $28,870,969,833 | Fịyatị | Go to USDC(opens in a new tab) |
![]() | $5,014,800,323 | Crypto | Go to Dai(opens in a new tab) |
![]() | $1,289,986,442 | Fịyatị | Go to TrueUSD(opens in a new tab) |
![]() | $646,584,148 | Nke usoro emume | Go to Frax(opens in a new tab) |
Otu e si enweta ego stebụlkọịn
Ihe ndi ị ga-enwe
O kwesiri ka i nwee akpa ego kripto ga-enye gi ikike ị ga eji gbanwee ma chedoi mkpuru ego kripto gị
Iji kwụọ ụgwọ maka mgbanwe
Ndụmọdụ onye ndezi akwụkwọ
Nwetara onwe gi akpa ego ịntanetị kripto nke ga-enye gi ike i ga eji zụta ETH ma gbanwe ya were nweta tokin, gunyere stebụlkọịn.
Chọta akpa ego ịntanetịNgwa dapps ndi e ji agbanwe mkpụrụ ego token ga
Ọ bụrụ na i nwetala ETH na akpa ego ịntanetị, I nwere ike iji ngwa dapps ndịa wee gbanwere stebụlkọịn. Ihe ndị ọzọ gbasara ngwa mgbanwe akụ ga-agbakọ aka nwere
Ihe ndi ị ga-enwe
Akaụntụ nke si n'aka ebe mgbanwe akụ maọbụ akpa ego ịntanetị nke i nwere ike isi na ya gote crypto. E nwere ike bụrụ na i jirila otu gote ETH. Tulee k'ihụ udị ọrụ i nwere ike iji mee ihe n'ebe ibi.
Tulee ọrụ ndị i nwere ike iji mee ihe n'ebe i bi
Ihe ndi ị ga-enwe
Stebụlkọịn bụ nnukwu usoro ịkwụ ụgwọ maka ọrụ n'ihi na uru ahụ kwụsiri ike. Mana ị ga-achọ akpa ego a ga eji kwụọ gi ụgwọ.
I ga-enwe akpa ego ịntanetị iji nweta stebụlkọịn ndi i ritere
Ebe ị ga-erite stebụlkọịn
Ndịa bụ otu ndi ga-akwụ gị ụgwọ na stebụlkọịn maka ọrụ gi.


Ihe ndi ị ga-enwe
Iji bite stebụlkọịn ị ga-eji ngwa dapp kwesiri ekwesi. Ị ga-enwekwa akpa ego nakwa ụfọdụ ETH.
Ị ga-achọ akpa ego ịntanetị ị ga eji jiri ngwa dapp
ETH ga-abara gị uru maka iji kwado ịgba mbibi nakwa/maọbụ iji kwụọ ụgwọ azụmahịa
Ihe ịgba mbibi Crypto
I nwere ike iji Ethereum gbara mbibi n'aka ndị ọzọ n'erefughi ETH gị. Nke a nwere ike i nye gi ihe a kpọrọ leverage - ufọdụ na-eme nke a iji kpokọba ETH ọzọ. Ihe ndị ọzọ na stablecoin ndi e ji crypto kwadoo
Mana n'ihi na ọnụ ahịa ETH n'agbanye oge ọbụla, ihe nkwado mbibi gi ga akarị ego ole Ị chọrọ. Nkea pụtara na ị chọọ ibiri mkpuruego ndi ọnụ ahịa ha kwụ ekeresu a kpọrọ stablecoin 100 ị ga-enwe opekatampe ETH ruru $150. Nke a bụ iji chekwaa usoro a nakwa ndị na-ebinye ego.
Ebe ndị Ị ga-ebite stebụlkọịn
Ngwa dapps ndị a ga-enye gị ohere iji cypto dị ka ihe nkwado wee biri stebụlkọịn. Ụfọdụ na-nabata mkpuru ego ndị ọzọ na-nabatakwa ETH.
Ihe ize ndụ
Ọ bụrụ n'iji ETH were gbara mbibi ma ọnụ ahịa ya wee daa, nkwado mbibi gị agaghizikwa ekpuchite stebụlkọịn ndi ahụ i biiri. Nke a ga-eme ka ETH gị gbarisie ma e nwekwara ike taa gị ahụhụ. Ya mere, ọ bụrụ na ị gbara mbibi stebụlkọịn, anya gi kwesiri ịdị n'ọnụahịa ETH. Ọnụ ahịa ETH kacha ọhụrụ
Were stebụlkọịn chedoo ego
Stebụlkọịn na-enwe egoahia na akarị okike ọmụrụnwa maka na e nwere ọtụtụ ọchịchọ maka ibite ha. E nwere ngwa dapp na-enye gi ikike ka ị na-erita ọmụrụnwa na stebụlkọịn n'oge site n'ikwunye ha n'ebe okike. Dị ka o si dị n'ụlọ akụ, ị na-eke tokin gi maka ndị mbite ego mana i nwekwara ike iwere tokin na ọmụrụnw gị mgbe ọbụla.
Dapp ndị na-amịpụta ọmụrụnwa
Were stebụlkọịn gị mee ihe bara uru ma mita ọmụrụnwa. Dika ihe nile di na kripto, Pasenti Ọmụrụnwa A Tụrụ Anya ya Kwa Afọ (APY) nwere ike igbanwe ụbọchị kwa ubochi dabere n'ozugbo e kesara maọbụ chọọ ha.
Pasent 0.05
Ọnụọgụ ego nke ndị ụlọ akụ kwụrụ maka mbido, akaụntụ ọzụzụ ego nke gọọmenti etiti nke USA mere mkpuchi maka ya. Isi mmalite(opens in a new tab)Etu ha si arụ ọrụ: ụdị stebụlkọịn dịgasị
Hụ na ị na-e me nnyocha nke gị mgbe niile
Algorithmic stablecoins are experimental technology. You should be aware of the risks before using them.Nke Fịyatị kwadoro
Uru
- E chekwara ya maka ndaghari kripto.
- Mgbanwe ọnụahịa dị obere.
Ọghọm
- Nke nwere onye isi – a ga enweriri onye ga-enye tokin.
- Ọ dị mkpa ka e nyochaa ya iji hụ na ụlọ ọrụ nwere ndobe akụ zuru ezu.
Ihe atụ oru ngo
Nke crypto kwadoro
Ọla dị oke ọnụ
Nke usoro emume
Mụtakwuo ihe banyere stebụlkọịn
Dashboard na Education
- Gaato Stablecoins.wtf website(opens in a new tab)Stablecoins.wtfStablecoins.wtf na-enye ngosi dashịbọọdụ nwere data azụmahịa, ọnụ ọgụgụ, na ihe banyere mmụta maka ego stebụlkọịn pụrụ iche.